9Ọ bụrụ na unu alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka e gosi ụmụnna unu na ụmụ unu a dọtara nʼagha obi ebere, meekwa ka ha site nʼebe e bugara ha lọghachikwa. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ onye obi ebere, na onye obiọma; ọ gakwaghị agbakụta unu azụ, ma ọ bụrụ na unu echegharịa, lọghachikwute ya.”
10Ya mere, ndị ọgbọ ọsọ ozi ahụ sitere otu obodo gaa obodo ọzọ nʼIfrem, na Manase, ọ bụladị ruo Zebụlọn. Ma ndị mmadụ chịrị ha ọchị, kwaakwa ha emo.
11Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem.
12Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.
13Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko.