11Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem.
12Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.
13Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko.
14Ha niile jiri otu obi bibie ụlọ arụsị Baal niile dị na Jerusalem, kụtuokwa ebe ịchụ aja na-esi isi ụtọ niile, buru ha niile bufuo ha na Ndagwurugwu Kidrọn.
15Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.