13Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko.
14Ha niile jiri otu obi bibie ụlọ arụsị Baal niile dị na Jerusalem, kụtuokwa ebe ịchụ aja na-esi isi ụtọ niile, buru ha niile bufuo ha na Ndagwurugwu Kidrọn.
15Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
16Ha niile guzokwara nʼọnọdụ ha dịka e dere ya nʼiwu Mosis, onye nke Chineke. Ndị nchụaja fesara ọbara nke ndị Livayị bunyere ha nʼaka, nʼelu ebe ịchụ aja.
17Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị.