2 Ihe E Mere 30

Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị.

2 Chronicles 30:17 (UKJV) For there were many in the congregation that were not sanctified: therefore the Levites had the charge of the killing of the passovers for every one that was not clean, to sanctify them unto the LORD.

15Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

16Ha niile guzokwara nʼọnọdụ ha dịka e dere ya nʼiwu Mosis, onye nke Chineke. Ndị nchụaja fesara ọbara nke ndị Livayị bunyere ha nʼaka, nʼelu ebe ịchụ aja.

17Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị.

18Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, “Ka Onyenwe anyị onye dị mma gbaghara onye ọbụla

19bụ ndị ji obi ha na-achọ Onyenwe anyị Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.