2 Ihe E Mere 31

Mgbe ihe niile a gwụsịrị, ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ pụrụ gaa nʼobodo niile dị na Juda, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. Ha kwatụrụ ebe niile dị elu na ebe ịchụ aja niile dị na Juda, Benjamin, Ifrem na Manase. Mgbe ha lachara ha niile nʼiyi, ndị Izrel niile laghachiri nʼobodo nke aka ha nakwa nʼihe onye ọbụla nwere.

2 Chronicles 31:1 (UKJV) Now when all this was finished, all Israel that were present went out to the cities of Judah, and brake the images in pieces, and cut down the groves, and threw down the high places and the altars out of all Judah and Benjamin, in Ephraim also and Manasseh, until they had utterly destroyed them all. Then all the children of Israel returned, every man to his possession, into their own cities.

1Mgbe ihe niile a gwụsịrị, ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ pụrụ gaa nʼobodo niile dị na Juda, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. Ha kwatụrụ ebe niile dị elu na ebe ịchụ aja niile dị na Juda, Benjamin, Ifrem na Manase. Mgbe ha lachara ha niile nʼiyi, ndị Izrel niile laghachiri nʼobodo nke aka ha nakwa nʼihe onye ọbụla nwere.

2Hezekaya kenyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị nʼusoro ịrụ ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke ụbọchị niile, maka ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo, na inye ekele, na ito Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ama ebe obibi ya.

3Eze nyekwara ụtụ nke ya site nʼihe nweta ya maka iji chụọ aja nsure ọkụ, nke ụtụtụ na abalị, ya na aja nsure ọkụ nke ụbọchị izuike niile na ọnwa ọhụrụ, na nke mmemme niile a kara aka a na-eme dịka ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.