1Josaya mere Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị na Jerusalem nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ. Ha gburu atụrụ Mmemme Ngabiga nʼụbọchị ahụ
2O debekwara ndị nchụaja nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, gbaa ha ume ka ha bidokwa ịrụ ọrụ ha.
3Ọ sịrị ndị Livayị, bụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ndị na-emekwa ka ndị Izrel ghọta ihe, “Dọnyenụ igbe nsọ ahụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn, nwa Devid, bụ eze Izrel wuru. Unu ekwesịkwaghị ị na-ebugharị ya nʼubu unu ọzọ. Ugbu a jeerenụ Onyenwe anyị Chineke unu, na ndị ya Izrel ozi.