2 Ihe E Mere 35

O debekwara ndị nchụaja nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, gbaa ha ume ka ha bidokwa ịrụ ọrụ ha.

2 Chronicles 35:2 (UKJV) And he set the priests in their charges, and encouraged them to the service of the house of the LORD,

1Josaya mere Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị na Jerusalem nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ. Ha gburu atụrụ Mmemme Ngabiga nʼụbọchị ahụ

2O debekwara ndị nchụaja nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, gbaa ha ume ka ha bidokwa ịrụ ọrụ ha.

3Ọ sịrị ndị Livayị, bụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ndị na-emekwa ka ndị Izrel ghọta ihe, “Dọnyenụ igbe nsọ ahụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn, nwa Devid, bụ eze Izrel wuru. Unu ekwesịkwaghị ị na-ebugharị ya nʼubu unu ọzọ. Ugbu a jeerenụ Onyenwe anyị Chineke unu, na ndị ya Izrel ozi.

4Kwadoonụ onwe unu nʼusoro ezinaụlọ unu nʼotu nʼotu, dịka ntụziaka ihe Devid, eze Izrel dere nʼakwụkwọ si dị, ya na nke Solomọn nwa ya si dịkwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.