2 Ihe E Mere 35

Kwadoonụ onwe unu nʼusoro ezinaụlọ unu nʼotu nʼotu, dịka ntụziaka ihe Devid, eze Izrel dere nʼakwụkwọ si dị, ya na nke Solomọn nwa ya si dịkwa.

2 Chronicles 35:4 (UKJV) And prepare yourselves by the houses of your fathers, after your courses, according to the writing of David king of Israel, and according to the writing of Solomon his son.

2O debekwara ndị nchụaja nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, gbaa ha ume ka ha bidokwa ịrụ ọrụ ha.

3Ọ sịrị ndị Livayị, bụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ndị na-emekwa ka ndị Izrel ghọta ihe, “Dọnyenụ igbe nsọ ahụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn, nwa Devid, bụ eze Izrel wuru. Unu ekwesịkwaghị ị na-ebugharị ya nʼubu unu ọzọ. Ugbu a jeerenụ Onyenwe anyị Chineke unu, na ndị ya Izrel ozi.

4Kwadoonụ onwe unu nʼusoro ezinaụlọ unu nʼotu nʼotu, dịka ntụziaka ihe Devid, eze Izrel dere nʼakwụkwọ si dị, ya na nke Solomọn nwa ya si dịkwa.

5“Werenụ ọnọdụ nʼebe nsọ unu na otu ndị Livayị, maka nkewa nke ezinaụlọ nna nna unu ha si dị, bụ ikwu ndị Izrel, ndị na-abụghị ndị nchụaja.

6Gbuonụ atụrụ ngabiga ndị ahụ, doonụ onwe unu nsọ, doziekwaranụ ụmụnna unu ndị Izrel aja ha, ime dịka ihe Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu si dị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.