2 Ihe E Mere 35

Mgbe e dozichara usoro ije ozi ahụ niile, ndị nchụaja weere ọnọdụ ha, ha na ndị Livayị nʼoke ọrụ ha nʼusoro dịka eze nyere nʼiwu.

2 Chronicles 35:10 (UKJV) So the service was prepared, and the priests stood in their place, and the Levites in their courses, according to the king's commandment.

8Ndịisi ya nyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị onyinye afọ ofufu. Otu a kwa, Hilkaya na Zekaraya, na Jehiel, ndị na-elekọta ụlọnsọ Chineke nyere ndị nchụaja puku ewu na atụrụ abụọ na narị isii, nyekwa ha narị oke ehi atọ, maka iji chụọ aja Ngabiga.

9Ndị bụ ndị ndu nʼebo Livayị aha ha bụ Konanaya, na Shemaya, na Netanel, na nwanne ya Hashabaya, na Jeiel, na Jozabad, nyere ndị Livayị puku ewu na atụrụ ise, na narị oke ehi ise maka iji ha chụọ aja Ngabiga.

10Mgbe e dozichara usoro ije ozi ahụ niile, ndị nchụaja weere ọnọdụ ha, ha na ndị Livayị nʼoke ọrụ ha nʼusoro dịka eze nyere nʼiwu.

11Mgbe ahụ ndị Livayị gburu atụrụ ngabiga ahụ niile, were ọbara ha nye ndị nchụaja. Ha fesara ya nʼebe ịchụ aja mgbe ndị Livayị nọ na-agba anụ ndị ahụ akpụkpọ.

12Ha kenyere ezinaụlọ ọbụla anụ ndị ahụ niile ka ha jiri nke ha ketara chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼusoro dịka e dere nʼime akwụkwọ Mosis. Otu a ka ha mekwara banyere ehi ndị ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.