2 Ihe E Mere 35

E mebeghị Mmemme Ngabiga nʼụdị a nʼIzrel, site nʼụbọchị Samuel onye amụma, o nwebekwaghị eze Izrel ọbụla nke merela mmemme a dịka Josaya mere, ya na ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị Juda niile na ndị Izrel niile bụ ndị nọ nʼebe ahụ tinyere ndị Jerusalem.

2 Chronicles 35:18 (UKJV) And there was no passover like to that kept in Israel from the days of Samuel the prophet; neither did all the kings of Israel keep such a passover as Josiah kept, and the priests, and the Levites, and all Judah and Israel that were present, and the inhabitants of Jerusalem.

16Ya mere, e doziri ofufe niile nke Onyenwe anyị nʼotu ụbọchị ahụ, maka ime Mmemme Ngabiga na ịchụ aja nsure ọkụ niile nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, dịka eze Josaya nyere nʼiwu.

17Ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ mere Mmemme Ngabiga nʼoge ahụ, meekwa mmemme achịcha ekoghị eko ụbọchị asaa.

18E mebeghị Mmemme Ngabiga nʼụdị a nʼIzrel, site nʼụbọchị Samuel onye amụma, o nwebekwaghị eze Izrel ọbụla nke merela mmemme a dịka Josaya mere, ya na ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị Juda niile na ndị Izrel niile bụ ndị nọ nʼebe ahụ tinyere ndị Jerusalem.

19Ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, ka e mere Mmemme Ngabiga a.

20Emesịa, mgbe Josaya hazisịrị ihe nʼụlọnsọ ahụ, Neko eze Ijipt gbagoro ịga buo agha na Kakemish, nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis. Mgbe ahụ, Josaya pụkwara izute ya nʼagha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.