2 Ihe E Mere 35

Emesịa, mgbe Josaya hazisịrị ihe nʼụlọnsọ ahụ, Neko eze Ijipt gbagoro ịga buo agha na Kakemish, nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis. Mgbe ahụ, Josaya pụkwara izute ya nʼagha.

2 Chronicles 35:20 (UKJV) After all this, when Josiah had prepared the temple, Necho king of Egypt came up to fight against Charchemish by Euphrates: and Josiah went out against him.

18E mebeghị Mmemme Ngabiga nʼụdị a nʼIzrel, site nʼụbọchị Samuel onye amụma, o nwebekwaghị eze Izrel ọbụla nke merela mmemme a dịka Josaya mere, ya na ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị Juda niile na ndị Izrel niile bụ ndị nọ nʼebe ahụ tinyere ndị Jerusalem.

19Ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, ka e mere Mmemme Ngabiga a.

20Emesịa, mgbe Josaya hazisịrị ihe nʼụlọnsọ ahụ, Neko eze Ijipt gbagoro ịga buo agha na Kakemish, nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis. Mgbe ahụ, Josaya pụkwara izute ya nʼagha.

21Ma Neko zipụrụ ndị ozi bịara zie Josaya ozi, sị ya, “Olee esemokwu dị ugbu a nʼetiti mụ na gị, gị eze Juda? Ọ bụghị ibuso gị agha ka m bịara, kama ọ bụ naanị ụlọ mụ na ha nọ nʼagha. Chineke sịrị m ka m mee ngwa; ya mere, egbochikwala Chineke onye nọnyeere m, ka ọ ghara iji iwe bibie gị.”

22Ma Josaya esiteghị nʼebe ọ nọ chigharịa, kama o nwogharịrị onwe ya, ka a ghara ịmata onye ọ bụ, maka ịga buso ya agha. O geghịkwa ntị na okwu ahụ eze Neko kwuru nke si nʼaka Chineke bịa, kama ọ pụrụ ibuso ya agha nʼala Megido.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.