2 Ihe E Mere 4

Solomọn wukwara ebe ịchụ aja bronz. Ogologo ya ruru iri mita na ọkara. Obosara ya rukwara iri mita na ọkara; ma ịdị elu ya dị mita ise na ụma atọ.

2 Chronicles 4:1 (UKJV) Moreover he made an altar of brass, twenty cubits the length thereof, and twenty cubits the breadth thereof, and ten cubits the height thereof.

1Solomọn wukwara ebe ịchụ aja bronz. Ogologo ya ruru iri mita na ọkara. Obosara ya rukwara iri mita na ọkara; ma ịdị elu ya dị mita ise na ụma atọ.

2O mekwara Oke osimiri nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe nke ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu.

3Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ụmụ oke ehi gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ehi ndị ahụ dị nʼahịrị abụọ. A wụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.