17Ma ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, ka okwu gị, bụ nkwa nke i kwere ohu gị Devid bịa na mmezu.
18“Ma ọ bụ ezie na Chineke ga-ebinyere ụmụ mmadụ nʼelu ụwa? Lee, eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị!
19Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị.
20Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, ehihie na nʼabalị, bụ ebe a i kwuru sị, na i ga-akpọkwasị Aha gị nʼebe ahụ. Biko, ka ị nụrụ ekpere ohu gị ga-ekpe banyere ebe a.
21Nụrụkwa arịrịọ niile nke ohu gị na nke ndị gị Izrel niile, mgbe ọbụla ha chere ihu ha nʼebe a nʼekpere. Biko, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ, mgbe ị nụrụ biko, gbagharakwa.