15I mezuokwala nkwa niile i kwere nna m Devid, bụ ohu gị. I ji ọnụ gị kwee nkwa a, ma taa, i jirila aka gị mezuo ya.
16“Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, mezukwaa nkwa niile i kwere Devid nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ dịka iwu m si dị nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu nʼocheeze Izrel nʼime ha.’
17Ma ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, ka okwu gị, bụ nkwa nke i kwere ohu gị Devid bịa na mmezu.
18“Ma ọ bụ ezie na Chineke ga-ebinyere ụmụ mmadụ nʼelu ụwa? Lee, eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị!
19Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị.