2 Ihe E Mere 9

Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie

2 Chronicles 9:17 (UKJV) Moreover the king made a great throne of ivory, and overlaid it with pure gold.

15Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram isii ka e ji kpụọ ọta ọbụla.

16Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn.

17Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie

18Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii na ihe ịtụkwasị ụkwụ eji ọlaọcha rụọ nke ejikọtara nʼahụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha.

19Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.