2 Ihe E Mere 9

Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.

2 Chronicles 9:19 (UKJV) And twelve lions stood there on the one side and on the other upon the six steps. There was not the like made in any kingdom.

17Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie

18Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii na ihe ịtụkwasị ụkwụ eji ọlaọcha rụọ nke ejikọtara nʼahụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha.

19Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.

20Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn.

21Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nke ndị ohu Hiram na-elekọta. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ ndị a na-alọta buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.