11Ma ana m eme ka ndị dị otu a ghọta na ihe anyị na-ekwu site nʼakwụkwọ ozi mgbe anyị na-anọghị nʼetiti unu, ka anyị ga-eme ma anyị nọrọ nʼetiti unu.
12Anyị enweghị anya ike ihazi ọnọdụ maọbụ were onwe anyị tụnyere ndị ụfọdụ na ndị ahụ nʼeto onwe ha. Ma mgbe ha na-eji onwe ha na-atụ onwe ha, werekwa onwe ha na-atụnyere onwe ha, ha adịghị ezipụta nghọta.
13Ma anyị onwe anyị, adịghị anya isi banyere ihe ọbụla anyị na-enweghị ike ime. Kama anyị ga-anya isi nʼoke ọrụ ahụ Chineke kenyere anyị, ka anyị rụrụte ọ bụladị ruo nʼebe unu nọ.
14Nʼihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nʼihe gbasara unu, nʼihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu oziọma gbasara Kraịst.
15Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ niile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nʼetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu ga na-eto eto mgbe niile, ka ọrụ ya nʼetiti unu bụrụ nke ga-eto eto.