2 Ndị Kọrint 10

Nʼihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nʼihe gbasara unu, nʼihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu oziọma gbasara Kraịst.

2 Corinthians 10:14 (UKJV) For we stretch not ourselves beyond our measure, as though we reached not unto you: for we are come as far as to you also in preaching the gospel of Christ:

12Anyị enweghị anya ike ihazi ọnọdụ maọbụ were onwe anyị tụnyere ndị ụfọdụ na ndị ahụ nʼeto onwe ha. Ma mgbe ha na-eji onwe ha na-atụ onwe ha, werekwa onwe ha na-atụnyere onwe ha, ha adịghị ezipụta nghọta.

13Ma anyị onwe anyị, adịghị anya isi banyere ihe ọbụla anyị na-enweghị ike ime. Kama anyị ga-anya isi nʼoke ọrụ ahụ Chineke kenyere anyị, ka anyị rụrụte ọ bụladị ruo nʼebe unu nọ.

14Nʼihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nʼihe gbasara unu, nʼihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu oziọma gbasara Kraịst.

15Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ niile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nʼetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu ga na-eto eto mgbe niile, ka ọrụ ya nʼetiti unu bụrụ nke ga-eto eto.

16Nke a ga-eme ka anyị nwee ike zisaa oziọma ahụ na mba ndị ọzọ ndị dị nʼofe ala unu, ghara iji ọrụ arụrụ nʼebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ na-etu ọnụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.