21Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a. Ọ bụrụ na onye ọbụla anwaa anwaa nyaa isi nʼihe ọbụla (ana m ekwu dịka onye nʼenweghị uche), mụ onwe m ga-anyakwa isi.
22Ha bụ ndị Hibru? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị Izrel? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị agbụrụ Ebraham? Mụ onwe m bụkwa.
23Ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi? (Ana m ekwu dịka onye anya na-adịghị mma.) Ma mụ onwe m ejela ozi karịa. Adọgbuola m onwe m nʼọrụ karịa ha niile. Etinyela m nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe, tinyere ọtụtụ ihe otiti, mgbe mgbe anọọla m nʼọnụ ọnwụ.
24Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri anọ e wepụrụ otu.
25E jirila okporo igwe tie m ugboro atọ. Atụrụ m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nʼime ya kpuru nʼoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nʼelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m.