22Ha bụ ndị Hibru? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị Izrel? Mụ onwe m bụkwa ya. Ha bụ ndị agbụrụ Ebraham? Mụ onwe m bụkwa.
23Ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi? (Ana m ekwu dịka onye anya na-adịghị mma.) Ma mụ onwe m ejela ozi karịa. Adọgbuola m onwe m nʼọrụ karịa ha niile. Etinyela m nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe, tinyere ọtụtụ ihe otiti, mgbe mgbe anọọla m nʼọnụ ọnwụ.
24Ugboro ise ka ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri anọ e wepụrụ otu.
25E jirila okporo igwe tie m ugboro atọ. Atụrụ m nkume otu ugboro. Ugboro atọ ka ụgbọ mmiri m nọ nʼime ya kpuru nʼoke osimiri. Anọọla m otu abalị na ụbọchị so ya nʼelu oke osimiri ebe mmiri na-ebugharị m.
26Ejeela m ọtụtụ ogologo ije nke ọtụtụ ihe ize ndụ dị nʼime ya. Nʼize ndụ site nʼosimiri, ize ndụ site na ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike, ize ndụ site nʼaka ndị obodo nke aka m. Ọtụtụ mgbe ka m zere ndụ site nʼaka ndị mba ọzọ, nʼime obodo ukwu, nʼọzara ma nʼoke osimiri; na nʼaka ndị kpọrọ onwe ha ụmụnna m, ma ha bụ ndị ụgha.