1Anyị na-ebido ito onwe anyị ọzọ? Ọ dị a mkpa anyị inye unu, maọbụ ịnata nʼaka unu akwụkwọ nkọwa iji too onwe anyị dịka ụfọdụ mmadụ ndị ọzọ si eme?
2Unu onwe unu bụ akwụkwọ ozi anyị nke e dere nʼobi anyị nke mmadụ niile maara ma gụọkwa.
3Unu na-egosikwa na unu bụ akwụkwọ ozi si nʼebe Kraịst nọ, mpụta ihe nke ozi anyị jere. Ọ bụghị ihe e ji inki dee na mbadamba nkume, kama ọ bụ mmụọ Chineke na-adị ndụ ka e ji dee ya na mbadamba obi mmadụ.
4Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ.