2 Ndị Kọrint 3

ọ bụ nʼije ozi nke Mmụọ nsọ agaghị adị ebube karịa?

2 Corinthians 3:8 (UKJV) How shall not the ministration of the spirit be rather glorious?

6Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ.

7Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga,

8ọ bụ nʼije ozi nke Mmụọ nsọ agaghị adị ebube karịa?

9Ọ bụrụ na-enwere ebube nʼime ije ozi nke amamikpe, ije ozi nke ezi omume ga-adị ebube karịa ya.

10Nʼezie, ihe jupụtara nʼebube mgbe ochie enwekwaghị ebube ọbụla ugbu a, nʼihi na ebube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ekpuchiela ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.