7Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga,
8ọ bụ nʼije ozi nke Mmụọ nsọ agaghị adị ebube karịa?
9Ọ bụrụ na-enwere ebube nʼime ije ozi nke amamikpe, ije ozi nke ezi omume ga-adị ebube karịa ya.
10Nʼezie, ihe jupụtara nʼebube mgbe ochie enwekwaghị ebube ọbụla ugbu a, nʼihi na ebube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ekpuchiela ya.
11Ọ bụrụ na ihe na-agafe agafe nwere ebube dị otu a, ihe ga-anọgide mgbe niile ga-enwe ebube karịa ya.