12Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu.
13Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu,
14ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya.
15Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.
16Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.