14ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya.
15Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.
16Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.
17Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu.
18Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.