2 Ndị Kọrint 5

Ugbu a anyị nọ na-asụ ude, na-enwe agụụ inweta ebe obibi anyị dị nʼeluigwe.

2 Corinthians 5:2 (UKJV) For in this we groan, earnestly desiring to be clothed upon with our house which is from heaven:

1Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe.

2Ugbu a anyị nọ na-asụ ude, na-enwe agụụ inweta ebe obibi anyị dị nʼeluigwe.

3Ka ọ ga-abụ anyị yiri ya, ka anyị hapụ ịdị ka ndị gba ọtọ.

4Mgbe ahụ niile anyị nọ nʼime ụlọ ikwu a, anyị na-anọgide nʼịsụ ude nke ibu arọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị na-enweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nʼihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ a pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.