2Ugbu a anyị nọ na-asụ ude, na-enwe agụụ inweta ebe obibi anyị dị nʼeluigwe.
3Ka ọ ga-abụ anyị yiri ya, ka anyị hapụ ịdị ka ndị gba ọtọ.
4Mgbe ahụ niile anyị nọ nʼime ụlọ ikwu a, anyị na-anọgide nʼịsụ ude nke ibu arọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị na-enweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nʼihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ a pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi.
5Chineke onye ya onwe ya, bụ onye kwadobere anyị maka mgbanwo nke a, nyekwara anyị Mmụọ Nsọ ka ọ bụrụ onye ga-ahụ na anyị ga-enwetazu nkwa ahụ niile.
6Nʼihi nke a, anyị nwere obi ike mgbe niile, nʼihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nʼihu na-adị ndụ nʼanụ ahụ a, anyị na Onyenwe anyị anọghị.