5Chineke onye ya onwe ya, bụ onye kwadobere anyị maka mgbanwo nke a, nyekwara anyị Mmụọ Nsọ ka ọ bụrụ onye ga-ahụ na anyị ga-enwetazu nkwa ahụ niile.
6Nʼihi nke a, anyị nwere obi ike mgbe niile, nʼihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nʼihu na-adị ndụ nʼanụ ahụ a, anyị na Onyenwe anyị anọghị.
7Nʼihi ọ bụ okwukwe ka anyị ji adị ndụ ọ bụghị ihe anya hụrụ.
8Obi siri anyị ike. Ọ gaara amasị anyị ịhapụ ụlọ nke a anyị bi na ya, bụ ahụ anyị ma lakwuru Onyenwe anyị nʼebe obibi ya.
9Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ.