2Megheenụ obi unu nabata anyị, nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼetiti unu anyị mere ihe ọjọọ. O nwekwaghị onye anyị duhiere. Ọ dịkwaghị onye ọbụla anyị rigburu.
3Anaghị m ekwu ihe ndị a ka m maa unu ikpe, dịka m kwuburu na mbụ, na anyị bu unu nʼobi anyị, ịdịkọ ndụ, maọbụ ịnwụkọkwa ọnwụ nʼotu.
4Nkwuwa okwu m ji gwa unu okwu dị ukwuu; ịnya isi m nʼihi unu dịkwa ukwuu. Abụ m onye a gbara ume nʼebe ọ dị ukwu, nʼime ọnọdụ ahụhụ anyị niile, ana m aṅụrịbiga ọṅụ oke.
5Nʼihi na mgbe anyị batara Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nʼaka nri na aka ekpe bịakwute anyị, ọgụ nʼezi, egwu nʼime.
6Ma otu ọ dị, Chineke, onye na-agba ndị ike gwụrụ ume, gbara anyị ume site nʼọbịbịa Taịtọs.