2 Ndị Kọrint 8

Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya.

2 Corinthians 8:9 (UKJV) For all of you know the grace of our Lord Jesus Christ, that, though he was rich, yet for your sakes he became poor, that all of you through his poverty might be rich.

7Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a.

8Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa.

9Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya.

10Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nʼokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nʼafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya.

11Ma ugbu a mezuonụ ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nʼobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dịka ihe unu nwere si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.