1Nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash nwa Ahazaya na Juda, ka Jehoahaz nwa Jehu malitere ịbụ eze nʼIzrel nʼobodo Sameria. Ọ chịkwara na Sameria afọ iri na asaa.
2Kama Jehoahaz bụ eze ọjọọ. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O soro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie.
3Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu megide Izrel. O mere ka ha nọrọ nʼokpuru ọchịchị Hazael eze Aram na Ben-Hadad nwa ya ogologo oge.