1Nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash nwa Ahazaya na Juda, ka Jehoahaz nwa Jehu malitere ịbụ eze nʼIzrel nʼobodo Sameria. Ọ chịkwara na Sameria afọ iri na asaa.
2Kama Jehoahaz bụ eze ọjọọ. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O soro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie.
3Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu megide Izrel. O mere ka ha nọrọ nʼokpuru ọchịchị Hazael eze Aram na Ben-Hadad nwa ya ogologo oge.
4Ma Jehoahaz kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼoge a ka o nyere ya aka, Onyenwe anyị gere ya ntị, nʼihi na Chineke hụrụ mmegbu nke eze Aram na-emegbu ndị Izrel.
5Onyenwe anyị họpụtaara Izrel onye nzọpụta, ha sitere nʼaka ike ndị Aram nwere onwe ha. Izrel biri nʼụlọ nke aka ha dịka ha biiri nʼoge gara aga.