2 Ndị Eze 15

Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

2 Kings 15:22 (UKJV) And Menahem slept with his fathers; and Pekahiah his son reigned in his position.

20Menahem si nʼaka ndị Izrel nweta ego a. Onye ọgaranya ọbụla tụrụ iri shekel ọlaọcha ise nke e nyere eze Asịrịa. Mgbe eze Asịrịa natachara ọlaọcha ndị a, o si nʼala ahụ pụọ, ọ nọgidekwaghị nʼala ahụ.

21Akụkọ banyere Menahem na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?

22Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

23Nʼafọ nke iri ise, nke ọchịchị eze Azaraya na Juda, ka Pekahaya nwa Menahem bidoro ịchị dịka eze nʼIzrel. Afọ abụọ ka ọ chịrị nʼime Sameria.

24Ma Pekahaya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O sighị na mmehie niile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.