2 Ndị Eze 15

Akụkọ banyere Menahem na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?

2 Kings 15:21 (UKJV) And the rest of the acts of Menahem, and all that he did, are they not written in the book of the chronicles of the kings of Israel?

19Mgbe ahụ, Pul eze Asịrịa busoro ala ahụ agha. Menahem nyere ya otu puku talenti ọlaọcha, ime ka Pul kwagide ọchịchị ya, na ime ka aka ya siekwa ike nʼalaeze Izrel.

20Menahem si nʼaka ndị Izrel nweta ego a. Onye ọgaranya ọbụla tụrụ iri shekel ọlaọcha ise nke e nyere eze Asịrịa. Mgbe eze Asịrịa natachara ọlaọcha ndị a, o si nʼala ahụ pụọ, ọ nọgidekwaghị nʼala ahụ.

21Akụkọ banyere Menahem na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?

22Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

23Nʼafọ nke iri ise, nke ọchịchị eze Azaraya na Juda, ka Pekahaya nwa Menahem bidoro ịchị dịka eze nʼIzrel. Afọ abụọ ka ọ chịrị nʼime Sameria.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.