2 Ndị Eze 15

Nʼafọ nke iri ise, nke ọchịchị eze Azaraya na Juda, ka Pekahaya nwa Menahem bidoro ịchị dịka eze nʼIzrel. Afọ abụọ ka ọ chịrị nʼime Sameria.

2 Kings 15:23 (UKJV) In the fiftieth year of Azariah king of Judah Pekahiah the son of Menahem began to reign over Israel in Samaria, and reigned two years.

21Akụkọ banyere Menahem na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?

22Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

23Nʼafọ nke iri ise, nke ọchịchị eze Azaraya na Juda, ka Pekahaya nwa Menahem bidoro ịchị dịka eze nʼIzrel. Afọ abụọ ka ọ chịrị nʼime Sameria.

24Ma Pekahaya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O sighị na mmehie niile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie.

25Ma Peka nwa Remalaya, otu nʼime ndịisi agha eze na iri ndị ikom ise ọzọ si Gilead gbara izu megide ya, gbuo ya nʼụlọeze dị nʼime Sameria. Ha gbukwara Agob na Arie nʼoge a ha gburu Pekahaya. Emesịa, Peka ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.