2 Ndị Eze 15

Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya.

2 Kings 15:30 (UKJV) And Hoshea the son of Elah made a conspiracy against Pekah the son of Remaliah, and stroke him, and slew him, and reigned in his position, in the twentieth year of Jotham the son of Uzziah.

28O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O fere chi ọzọ ofufe, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ mmehie nke o dubara ndị Izrel nʼime ya.

29Nʼoge Peka bụ eze Izrel, ka Tiglat-Pilesa, eze Asịrịa bịara were Ijon, Ebel-Bet-Maaka, Janoa, Kedesh, Hazọ, Gilead, Galili na ala ndị Naftalị niile. Ọ chụpụrụ ndị mmadụ niile mee ka ha gaa biri nʼAsịrịa.

30Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya.

31Akụkọ banyere Peka na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel niile mere nʼụbọchị ndụ ha?

32Nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị Peka nwa Remalaya eze Izrel ka Jotam nwa Ụzaya eze Juda malitere ọchịchị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.