2 Ndị Eze 15

Nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị Peka nwa Remalaya eze Izrel ka Jotam nwa Ụzaya eze Juda malitere ọchịchị ya.

2 Kings 15:32 (UKJV) In the second year of Pekah the son of Remaliah king of Israel began Jotham the son of Uzziah king of Judah to reign.

30Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya.

31Akụkọ banyere Peka na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel niile mere nʼụbọchị ndụ ha?

32Nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị Peka nwa Remalaya eze Izrel ka Jotam nwa Ụzaya eze Juda malitere ọchịchị ya.

33Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ ghọrọ eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jerusha, nwa Zadọk.

34O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.