2 Ndị Eze 17

Ha manyeere onwe ha ogidi nkume, na ogidi chi Ashera nʼelu ugwu ọbụla, na nʼokpuru osisi ọbụla nwere ndo.

2 Kings 17:10 (UKJV) And they set them up images and groves in every high hill, and under every green tree:

8gbasoro omenaala niile nke ndị mba ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha. Ha gbasokwara omenaala ọjọọ ndị ahụ niile ndị eze ha webatara.

9Ndị Izrel mere ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị Chineke ha na-adịghị anabata na nzuzo. Ha wuru ebe ịchụ aja nye chi dị iche iche nʼobodo ha niile, e, nʼobodo ukwu ma nʼobodo nta ọbụla.

10Ha manyeere onwe ha ogidi nkume, na ogidi chi Ashera nʼelu ugwu ọbụla, na nʼokpuru osisi ọbụla nwere ndo.

11Ha chụrụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ọbụla dịka mba ndị naara ebi nʼala ahụ si eme, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha, mgbe Izrel bịara biri nʼebe ahụ. Ha mere ihe ọjọọ dị iche iche, nke mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu.

12E, ha fere arụsị dị iche iche ofufe, lefuo anya na Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Unu emela ihe dị otu a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.