2 Ndị Eze 17

gbasoro omenaala niile nke ndị mba ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha. Ha gbasokwara omenaala ọjọọ ndị ahụ niile ndị eze ha webatara.

2 Kings 17:8 (UKJV) And walked in the statutes of the heathen, whom the LORD cast out from before the children of Israel, and of the kings of Israel, which they had made.

6Nʼafọ itoolu nke ọchịchị Hoshea, eze Asịrịa dọtara Sameria nʼagha, dọkpụrụ ndị Izrel niile buga ha nʼala Asịrịa. O mere ka ha biri nʼobodo Hala, nʼime Gozan nke dị nʼosimiri Hoboa, na nʼime obodo ndị Midia.

7Ihe ndị a niile mere nʼihi na ndị Izrel mehiere megide Onyenwe anyị, bụ Chineke ha, onye ahụ mere ka ha site nʼokpuru ike Fero, eze Ijipt pụta. Ha kpọrọ isiala nye chi ndị ọzọ

8gbasoro omenaala niile nke ndị mba ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha. Ha gbasokwara omenaala ọjọọ ndị ahụ niile ndị eze ha webatara.

9Ndị Izrel mere ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị Chineke ha na-adịghị anabata na nzuzo. Ha wuru ebe ịchụ aja nye chi dị iche iche nʼobodo ha niile, e, nʼobodo ukwu ma nʼobodo nta ọbụla.

10Ha manyeere onwe ha ogidi nkume, na ogidi chi Ashera nʼelu ugwu ọbụla, na nʼokpuru osisi ọbụla nwere ndo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.