2 Ndị Eze 17

Ndị si Babilọn mere chi ha a na-akpọ Sukọt Benot; ndị si Kut emee Neagal, ebe ndị si Hamat mekwara Ashima.

2 Kings 17:30 (UKJV) And the men of Babylon made Succothbenoth, and the men of Cuth made Nergal, and the men of Hamath made Ashima,

28Ya mere, otu nʼime ndị nchụaja ebuuru site na Sameria gaa ala ọzọ, bịara biri na Betel, kuziere ha otu ha ga-esi na-atụ egwu Onyenwe anyị.

29Nʼagbanyeghị nke a, ndị mba ọbụla meere onwe ha chi nke aka ha nʼobodo ahụ niile ebe ha bi nʼime ya. Ha guzobere chi ndị a nʼụlọ arụsị nke ndị Sameria wuru nʼebe niile dị elu.

30Ndị si Babilọn mere chi ha a na-akpọ Sukọt Benot; ndị si Kut emee Neagal, ebe ndị si Hamat mekwara Ashima.

31Ndị si Ava mekwara Nibaz, na Tatak, ma ndị si Sefavaim na-esure ụmụ ha nʼọkụ dịka aja nye Adramelek na Anamelek, bụ chi ndị Sefavaim.

32Ha tụrụ egwu Onyenwe anyị, ma ha họpụtara ụdị mmadụ dị iche iche site nʼetiti onwe ha, ndị na-ejere ha ozi dịka ndị nchụaja nʼụlọ chi ha dị nʼebe niile dị elu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.