30Ndị si Babilọn mere chi ha a na-akpọ Sukọt Benot; ndị si Kut emee Neagal, ebe ndị si Hamat mekwara Ashima.
31Ndị si Ava mekwara Nibaz, na Tatak, ma ndị si Sefavaim na-esure ụmụ ha nʼọkụ dịka aja nye Adramelek na Anamelek, bụ chi ndị Sefavaim.
32Ha tụrụ egwu Onyenwe anyị, ma ha họpụtara ụdị mmadụ dị iche iche site nʼetiti onwe ha, ndị na-ejere ha ozi dịka ndị nchụaja nʼụlọ chi ha dị nʼebe niile dị elu.
33Ha na-atụ egwu Onyenwe anyị ma ha gara nʼihu na-efe chi nke aka ha dịka omenaala mba ebe ndị e si dọta ha nʼagha si dị.
34Ruo taa, ha na-anọgidesi ike nʼife ofufe dịka ụzọ ochie ha si dị. Ha adịghị atụ egwu Onyenwe anyị, maọbụ mee dịka ụkpụrụ na iwu niile, maọbụ dịka ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu si dị, bụ nke Onyenwe anyị nyere ụmụ Jekọb, onye ọ kpọrọ Izrel.