2 Ndị Eze 17

Ha na-atụ egwu Onyenwe anyị ma ha gara nʼihu na-efe chi nke aka ha dịka omenaala mba ebe ndị e si dọta ha nʼagha si dị.

2 Kings 17:33 (UKJV) They feared the LORD, and served their own gods, after the manner of the nations whom they carried away from thence.

31Ndị si Ava mekwara Nibaz, na Tatak, ma ndị si Sefavaim na-esure ụmụ ha nʼọkụ dịka aja nye Adramelek na Anamelek, bụ chi ndị Sefavaim.

32Ha tụrụ egwu Onyenwe anyị, ma ha họpụtara ụdị mmadụ dị iche iche site nʼetiti onwe ha, ndị na-ejere ha ozi dịka ndị nchụaja nʼụlọ chi ha dị nʼebe niile dị elu.

33Ha na-atụ egwu Onyenwe anyị ma ha gara nʼihu na-efe chi nke aka ha dịka omenaala mba ebe ndị e si dọta ha nʼagha si dị.

34Ruo taa, ha na-anọgidesi ike nʼife ofufe dịka ụzọ ochie ha si dị. Ha adịghị atụ egwu Onyenwe anyị, maọbụ mee dịka ụkpụrụ na iwu niile, maọbụ dịka ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu si dị, bụ nke Onyenwe anyị nyere ụmụ Jekọb, onye ọ kpọrọ Izrel.

35Mgbe Onyenwe anyị na ndị Izrel gbara ndụ, o nyere ha iwu sị, “Unu atụkwala chi ọzọ ọbụla egwu, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Unu efela ha ofufe maọbụ chụọ aja nye ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.