2 Ndị Eze 17

Mgbe Onyenwe anyị na ndị Izrel gbara ndụ, o nyere ha iwu sị, “Unu atụkwala chi ọzọ ọbụla egwu, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Unu efela ha ofufe maọbụ chụọ aja nye ha.

2 Kings 17:35 (UKJV) With whom the LORD had made a covenant, and charged them, saying, All of you shall not fear other gods, nor bow yourselves to them, nor serve them, nor sacrifice to them:

33Ha na-atụ egwu Onyenwe anyị ma ha gara nʼihu na-efe chi nke aka ha dịka omenaala mba ebe ndị e si dọta ha nʼagha si dị.

34Ruo taa, ha na-anọgidesi ike nʼife ofufe dịka ụzọ ochie ha si dị. Ha adịghị atụ egwu Onyenwe anyị, maọbụ mee dịka ụkpụrụ na iwu niile, maọbụ dịka ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu si dị, bụ nke Onyenwe anyị nyere ụmụ Jekọb, onye ọ kpọrọ Izrel.

35Mgbe Onyenwe anyị na ndị Izrel gbara ndụ, o nyere ha iwu sị, “Unu atụkwala chi ọzọ ọbụla egwu, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Unu efela ha ofufe maọbụ chụọ aja nye ha.

36Ma Onyenwe anyị, onye ji ike dị ukwuu, na aka dị ike e setịpụrụ esetipụ kpọpụta unu site nʼala Ijipt, bụ naanị onye unu ga-atụ egwu. Ya ka unu ga-akpọ isiala nye, ya ka unu ga-achụrụ aja.

37Unu ga-elezi anya hụ na unu debere ụkpụrụ na iwu niile, ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu ndị a e depụtara nʼakwụkwọ nye unu. Unu atụkwala egwu chi ndị ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.