2 Ndị Eze 17

Unu echefula ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. Unu akpọkwala isiala nye chi ndị ọzọ nʼihi egwu.

2 Kings 17:38 (UKJV) And the covenant that I have made with you all of you shall not forget; neither shall all of you fear other gods.

36Ma Onyenwe anyị, onye ji ike dị ukwuu, na aka dị ike e setịpụrụ esetipụ kpọpụta unu site nʼala Ijipt, bụ naanị onye unu ga-atụ egwu. Ya ka unu ga-akpọ isiala nye, ya ka unu ga-achụrụ aja.

37Unu ga-elezi anya hụ na unu debere ụkpụrụ na iwu niile, ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu ndị a e depụtara nʼakwụkwọ nye unu. Unu atụkwala egwu chi ndị ọzọ.

38Unu echefula ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. Unu akpọkwala isiala nye chi ndị ọzọ nʼihi egwu.

39Kama, tụọnụ egwu ma fee Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ ya ga-anapụta unu site nʼaka ndị iro unu niile.”

40Ma ndị Izrel egeghị ntị, kama, dịka ụzọ ọjọọ ha si dị, ha fere chi ọzọ ofufe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.