2 Ndị Eze 2

Mgbe ndị amụma ahụ si Jeriko nʼele anya, hụrụ ihe mere, ha sịrị, “Mmụọ Ịlaịja adakwasịla Ịlaisha.” Ha gara zute ya, kpọọ isiala nʼihu ya.

2 Kings 2:15 (UKJV) And when the sons of the prophets which were to view at Jericho saw him, they said, The spirit of Elijah does rest on Elisha. And they came to meet him, and bowed themselves to the ground before him.

13Emesịa, ọ chịlịri uwe mwụda Ịlaịja nke dapụrụ mgbe e weliri ya elu, laghachi bịa guzo nʼakụkụ osimiri Jọdan.

14O tiri akwa ahụ nʼelu mmiri ahụ jụọ sị, “Olee ebe Onyenwe anyị, Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe o tiri mmiri ahụ ihe, o kewakwara otu ụzọ nʼaka nri nke ọzọ nʼaka ekpe, Ịlaisha gafere nʼofe nke ọzọ.

15Mgbe ndị amụma ahụ si Jeriko nʼele anya, hụrụ ihe mere, ha sịrị, “Mmụọ Ịlaịja adakwasịla Ịlaisha.” Ha gara zute ya, kpọọ isiala nʼihu ya.

16Ha sịrị ya “Lee, anyị bụ ndị ohu gị nwere iri ndị ikom ise ahụ siri ike. Kwere ka ha ga chọgharịa nna gị ukwu. Ma eleghị anya mmụọ Onyenwe anyị eburula ya tụdakwa ya nʼotu ugwu, maọbụ nʼotu ndagwurugwu.” Ịlaisha zaghachiri, “Unu ezigala ha.”

17Ma mgbe ha nọgidere rịọsie ya arịrịọ ike, ruo mgbe o nwekwaghị ike igbochi ha. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, ziganụ mmadụ ka ha gaa chọọ ya.” Ha zigara iri ndị ikom ise, ndị gara chọgharịa Ịlaịja ụbọchị atọ, ma ha achọtaghị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.