17Josaya jụrụ ndị guzo nʼebe ahụ ajụjụ sị, “Ọ bụ ili onye bụ nke a?” Ndị ikom obodo ahụ zara sị, “Ọ bụ ili onye nke Chineke ahụ si Juda bịa buo amụma megide ebe ịchụ aja Betel. O buru amụma na ihe ndị a ị na-eme ebe ịchụ aja a ga-emezu.”
18Mgbe ahụ, Josaya zara sị ha, “Hapụnụ ya ka o guzoro onwe ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịchịpụta ọkpụkpụ ya.” Ha hapụrụ ọkpụkpụ ya, hapụkwa ọkpụkpụ onye amụma ahụ si Sameria bịa.
19Dịka o mere na Betel, otu a ka Josaya wepụrụ ma merụkwaa ebe ịchụ aja niile dị nʼebe niile dị elu nke ndị eze Izrel wuru nʼobodo niile nke Sameria, bụ ebe ịchụ aja kpasuru Onyenwe anyị iwe.
20O gburu ndị nchụaja chi ndị a niile nʼelu ebe ịchụ aja ha, suo ọkpụkpụ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ha. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, ọ laghachiri na Jerusalem.
21Eze nyere ndị Juda niile iwu sị ha, “Meerenụ Onyenwe anyị Chineke unu Mmemme Ngabiga, dịka e dere ya nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ a.”