20O gburu ndị nchụaja chi ndị a niile nʼelu ebe ịchụ aja ha, suo ọkpụkpụ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ha. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, ọ laghachiri na Jerusalem.
21Eze nyere ndị Juda niile iwu sị ha, “Meerenụ Onyenwe anyị Chineke unu Mmemme Ngabiga, dịka e dere ya nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ a.”
22O nwebeghị mgbe e mere ụdị Mmemme Ngabiga dịka nke a nʼoge ọbụla, site nʼụbọchị ndị ikpe bụ ndị duru Izrel maọbụ nʼụbọchị ndị eze Izrel na eze niile chịrị Juda, ọ dịghị nke yiri Mmemme Ngabiga a.
23Ma ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị eze Josaya, nʼime Jerusalem ka a nọ mee Mmemme Ngabiga a nye Onyenwe anyị.
24Ọzọkwa, Josaya gara nʼihu kpochapụ ndị niile na-ajụta mmụọ ọjọọ ase, na ndị dibịa afa, na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, na arụsị a pịrị apị, na ihe arụ niile nke a hụrụ nʼime Juda na Jerusalem niile. O mere nke a ka e mezuo ihe niile e dere nʼime akwụkwọ ahụ Hilkaya onye nchụaja chọtara nʼụlọ Onyenwe anyị.