2 Ndị Eze 25

Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn, o mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta nwere onwe ya. Ọ bụ nʼụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa iri na abụọ ka o mere nke a.

2 Kings 25:27 (UKJV) And it came to pass in the seven and thirtieth year of the captivity of Jehoiachin king of Judah, in the twelfth month, on the seven and twentieth day of the month, that Evilmerodach king of Babylon in the year that he began to reign did lift up the head of Jehoiachin king of Judah out of prison;

25Ma nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye ya onwe ya si nʼagbụrụ eze, duuru mmadụ iri bịa Mizpa, tigbuo Gedaliya, na ndị ikom Juda na ndị Kaldịa niile, bụ ndị ya na ha nọ.

26Nke a mere ka ndị Juda niile, site nʼonye nta ruo nʼonye ukwu, ha na ndịisi agha ndị ahụ biliri gaa Ijipt, nʼihi na ha tụrụ ndị Kaldịa egwu.

27Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn, o mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta nwere onwe ya. Ọ bụ nʼụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa iri na abụọ ka o mere nke a.

28Ọ gwara ya okwu ọma, nye ya oche ọnọdụ ya dị elu karịa nke ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babilọn.

29Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.