27Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn, o mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta nwere onwe ya. Ọ bụ nʼụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa iri na abụọ ka o mere nke a.
28Ọ gwara ya okwu ọma, nye ya oche ọnọdụ ya dị elu karịa nke ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babilọn.
29Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri.
30Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ.