2 Ndị Eze 3

Ọ sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, aga m eme ka ndagwurugwu a jupụta nʼolulu mmiri.

2 Kings 3:16 (UKJV) And he said, Thus says the LORD, Make this valley full of ditches.

14Ịlaisha sịrị, “Ebe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, bụ onye m na-efe, a si na ọ bụghị nsọpụrụ m nwere nʼebe Jehoshafat eze Juda nọ, agaraghị m atụpụrụ gị ọnụ maọbụ lee gị anya nʼihu.

15Ma ugbu a, kpọtaranụ m onye na-akpọ ụbọ.” Mgbe ọkpọ ụbọ ahụ malitere ịkpọ ụbọ ya, aka Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaisha.

16Ọ sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, aga m eme ka ndagwurugwu a jupụta nʼolulu mmiri.

17Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu agaghị ahụ ifufe maọbụ mmiri ozuzo, ma ndagwurugwu a ga-ejupụta na mmiri, unu onwe unu ga-aṅụ, na ehi unu, na anụmanụ ndị ọzọ unu ga-aṅụkwa mmiri.

18Ma nke a bụ ihe dị nta nʼebe Onyenwe anyị nọ, nʼihi na ọ ga-enyefekwa ndị Moab nʼaka unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.